Ned Nwoko: Nye ndị aka ha kwụ ọtọ ikike ibu egbe ma ha chọọ
Ebe akụkọ a si- Onye dere ya, Chimezie Ucheagbo na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Journalist
6 Febụwarị 2024
Ned Nwoko bụ onye omeiwu na-anọchi anya Aniocha/Oshimili dị na Delta steeti n'Ụlọomeiwu Ukwu akụwaala akuoyibo nsugbe.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere nsonso a, Nwoko kwuru na ọ ga dị mma ma ndị nkịtị nwee ikike ibu egbe maka nchekwa onwe ma ọ masị ha.
Nwoko kwuru na echiche a biara ya n’obi maka etu otụtụ mmadụ si adabanye n’aka ndị ekperima na ndị ntọrị mmadụ na Naịjirịa.
Dịka o siri kwuo, e nwere usoro ise onye ọbụla chọrọ ibu egbe kwesiri iso:
1. Onye dị otu a kwesiri ịga ọzụzụ na mmụta etu e si ebu egbe.
Ebe ahụ ka a ga-akụziri ya ihe niile gbasara egbe nakwa etu ọ ga-esi ji ya chekwaa onwe ya. Ụlọmmụta a kwesiri na ha ga-enwe ikike ire egbe.
2. Onye ahụ ga-agakwuru Eze obodo ya ka ọ gbara ya akaebe onye ọ bụ n’ezie.
3. Onye ahụ ga-aga hụ o pekata mpe dọkịta abụọ, otu n’ime ndị dọkịta ahụ ga-abụ dọkịta na-eleta ezịnaụlọ ya(family doctor.) Nke ọzọ ga-abụ dọkịta maara ya ọpekatampe afọ abụọ.
Ha abụọ ga elezie oye ahụ anya ma kwuo n’ezie na o zuru oke ibu egbe.
4. Nke atọ bụ na onye ahụ ga agakwuru onyeisi okpuruọchiịchị obodo ya, ya bu onyeisi ga abụru ya onyeakaebe dịka onye obodo ahụ.
5 . Ọzọ bu na onye ahụ ga-aga n’nka onyeisi uweojii, onyeisi uweeojii ga-ewe otụtụ oge mee nyocha pụruiche gbasara onye dị otua ahụ, ọ ga elezi anya ma kwuo ma onwe mgbe onye ahụ megidere iwu obodo.
6. Nke ikpeazụ bụ na onye ahụ choro ibu egbe ga-agaghachị ụlọọzuzụ ebum egbe ma gosi ha asambodo niile ọnatara n’ebe niile a ọgara maka na ọbụ ha ga-eresi ya egbe ma oge ruo.
Ụlọọzụzụ ebum egbe ga eji otu ọnwa nyochaa ma hụ na onye dị otua gazụrụ ebe niile o kwuru na ọ gara kwadoro ya tupuu ha eresi ya egbe.
‘’Leghara ndị na-ekwu na ndị mmadụ ga eji ikikere ibu egbe megbu mmadụ ibe ha, cheta na di na emegbu nwụnye, nwụnye na emegbu di mana ọkwusịghị ndị mmadụ ịlụ dị na nwụnye, ka anyị nye ndị Naịjiria ọhiere a ma nwalee ka ọga esi gaa’’ ka Nwoko kọwara.
Anthony Iyasele bu onye ọkaịwu gwara BBC na iwu Naịjịrịa kwadoro mmadụ ịzọ onwe ya mana ọ kwadọghị ibu egbe.
O kwuru na e nwere iwu na-ahụ maka ndị na-etinye akwụkwọ ị nata ikikere ibu egbe n’okpuru ndị uweojii nke a kpọrọ ‘Firearms act’.
‘’Amerịka nwere iwu nyere ndị obodo ha ikikere ibu egbe mana Briten eweghị iwu di otu a hụ, etu ahụ ka ọdị na Naịjirịa, anyị eweghị ikikere dị etu ahụ’’ Iyasele kọwara.
ncG1vNJzZmivp6x7o67CZ5qopV%2BetKO7jpqpraGTobK0e8JybnFonq2AdsXEqA%3D%3D